Ndị Hibru
1
Okwu Chineke site nʼỌkpara ya
1 Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche.
2 Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya.
3 Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe.
4 Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha.
Ịdị ukwuu nke Ọkpara Chineke
5 Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị,
“Ị bụ Ọkpara m.
Taa abụrụla m Nna gị”?
Maọbụ ọzọkwa,
“Aga m abụrụ ya Nna,
ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”?
6 Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị,
“Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”
7 O kwukwara banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị,
“Ọ na-eme ndị mmụọ ozi ya ka ha bụrụ ikuku,
na-emekwa ndị na-ejere ya ozi ka ha bụrụ ire ọkụ.”
8 Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị,
“Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ.
9 Ị hụrụ ezi omume nʼanya ma kpọọ ihe ọjọọ asị.
Nʼihi nke a, Chineke, nke bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị niile
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.”
10 Ọ sịkwara,
“Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa,
eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.
11 Ha ga-ala nʼiyi, ma gị onwe gị ga-anọgide.
Ha niile ga-aka nka dịka uwe.
12 Ị ga-apịakọta ha,
gbanwee ha dị ka akwa.
Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe.
Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”
13 O nweela mmụọ ozi ọbụla ọ sịrị,
“Nọdụ ala nʼaka nri m
ruo mgbe m ga-eme ndị iro gị
ihe mgbakwasị ụkwụ nye ụkwụ gị”?
14 Ndị mmụọ ozi niile, ha abụghị mmụọ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị a na-ezipụ ka ha jee ozi nʼihi ndị ahụ ga-eketa nzọpụta?